Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,194,761 members, 7,955,891 topics. Date: Sunday, 22 September 2024 at 06:01 PM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects (11048 Views)
The Dialects Of Ibibio And Where They Are Spoken / A List Of Igbo Dialects And Where Their Speakers Are Found. / List Of Yoruba Dialects (2) (3) (4)
(1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (Reply) (Go Down)
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by nedu210(m): 12:24am On Aug 05, 2012 |
@obiagu1 iya(yes) mgben is kita odumchi: Ọkwa ngwa ahu bu ihe ọdum, mma awọta ihe ika mana m awọta gbuhu ha nine. Ọ bụhụ kwa na ọtalu akpu nke ngwa ahu mana ọtakwalu ntọkọlọ akpu o. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by wesley80(m): 12:32am On Aug 05, 2012 |
ChinenyeN:Was only taking up a challenge in d spirit of the Olympics! nedu210: Ntii ka ishi? lolzz that literally translates to ears bigger than head? in my dialect. But I think I get you. Mbu onye Aboh ni Delta. Aboh bu afa obodom bu anyi na kpo ashi ornu anyi na su "Aboh". Ofuotu na kpo anyi ndi Ukwuani ese shi asusu anyi yini kalriaka. Lets see how well you understand mine. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ChinenyeN(m): 12:56am On Aug 05, 2012 |
wesley80:Lol nsogbu adigh. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by nedu210(m): 1:00am On Aug 05, 2012 |
wesley80:lol. I do understand. Awotal ihe ika mana ma ayahakwa uya awotagbuhukwem ihe ikalu. Otukwalum na enya ngwa imelu awọta ihe ma aka ngwan. Kam juo gu, aboh ọdụ na ukwuanu? |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by Obiagu1(m): 1:02am On Aug 05, 2012 |
wesley80: LMAO. This is really funny. Asụsụ gị afịarọ arụ. Ọ dị ka sọ m na-ahọta ife onye ọ bụna na-ekwu. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by AndreUweh(m): 1:06am On Aug 05, 2012 |
Obiagu1:Obiagu, you are too much. O wu ghi nwe aka. In Isinweke, we use eze-eze instead of ngwa-ngwa or osiso. We also use mmiri na ejo instead of mmiri na ezo. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ChinenyeN(m): 1:29am On Aug 05, 2012 |
Andre, nde Umungwa we, aka we la we nhie l'olee l'ala Ngwa? I maala? |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by wesley80(m): 1:35am On Aug 05, 2012 |
nedu210:Ukwuani di isu nebe, Ukwuani - enu ni Ukwuani - mmili. Ukwuani bu nowu "geographical location (Pardon me, sometimes the white man's tongue can be very handy) Ndi Aboh bu nde Ukwuani - mmili bu obuna shi anyi bu nde Ukwuani per se, obu nowu "geographical description". |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by nedu210(m): 1:36am On Aug 05, 2012 |
Andre Uweh:we also use miri na ejo in my place. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by nedu210(m): 1:44am On Aug 05, 2012 |
wesley80: Ukwuani di isu nebe, Ukwuani - enu ni Ukwuani - mmili. Ukwuani bu nowu "geographical location (Pardon me, sometimes the white man's tongue can be very handy) Ndi Aboh bu nde Ukwuani - mmili bu obuna shi anyi bu nde Ukwuani per se, obu nowu "geographical description". ok awọta gwom |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by wesley80(m): 1:50am On Aug 05, 2012 |
Ulra ebido ne lrum ke ebe orjo. Ka chi boh ni. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by nedu210(m): 2:01am On Aug 05, 2012 |
wesley80: Ulra ebido ne lrum ke ebe orjo. Ka chi boh ni.ngwan ka ọbọọ |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by odumchi: 2:39am On Aug 05, 2012 |
wesley80: Nedu, ndeewo. I yerele m aka ukwuuu. @Wesley Ande (anyi) ga abiariri. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by odumchi: 2:52am On Aug 05, 2012 |
Obiagu1: @ Nedu210, Oke Obiagu, 'Aga' is how the Aro people say 'how'. 'Za' is how we say 'si' (to come from). 'Risa/Rita' is how we Aro say 'cheta' (to remember) 'Rizo' is how we say 'chefuo' (to forget) In the Arochukwu dialect, 'gba' always replaces 'cha'. For example: English - Have you finished eating? Izugbe - Iri[b]chȧ[/b]la? Arochukwu - Iri[b]gbạ[/b]la? If you want to say "How did you (plural) do it" in Aro, you'll say: "Ndaa aga inyi za mee ya" In Izugbe: "Kedu ka unu si mee ya". |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ChinenyeN(m): 3:13am On Aug 05, 2012 |
odumchi: If you want to say "How did you (plural) do it" in Aro, you'll say:"Otu...si" o bu Izugbe? Eche m la o'u "ka...si" bu Izugbe. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by odumchi: 3:28am On Aug 05, 2012 |
ChinenyeN: Gbaghara mu o. M no na ari ihe olu (eche otu ihe) m dee ihe odo. M meziela ya. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ChinenyeN(m): 5:33am On Aug 05, 2012 |
A dii gbaghara obulagh ndinu. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by AndreUweh(m): 1:24pm On Aug 05, 2012 |
ChinenyeN: Andre, nde Umungwa we, aka we la we nhie l'olee l'ala Ngwa? I maala?Ju too niya Asha80, Ndi Umungwa wu ndi agbatobi ha. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by Obiagu1(m): 5:02pm On Aug 05, 2012 |
I feel that to improve Igbo language more, it needs to be more centralized while we incorporate various dialects into it. We only need to bring in adjectives, nouns and distinct verbs from various dialects to broaden the vocabulary like it is in English while we maintain a central structure and verbs should be standardized eliminating spelling differences like ejo/ezo, bụ/wụ, si/shi (said). Other spelling differences should be standardized too like ife/ihe, gini/kini, unu/ịnyị, mmiri/mmili etc. Ex. One could say: Aga m echiya azụ ọsịsọ maka mmiri na-ezo. Aga m echiya azụ ngwa-ngwa maka mmiri na-ezo. Aga m echiya azụ eze-eze maka mmiri na-ezo. Ọ bụ gịnị ka ị na-eme ugbua? Ọ bụ gịnị ka ị na-eme kita? Ọ bụ gịnị ka ị na-eme mgben? A similar example in English is: I think he is going mad. I think he is going crazy. I think he is going insane. Ndị be anyị, kee ife iche? |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ezeagu(m): 5:19pm On Aug 05, 2012 |
Chimamanda sị Igbò a maghi otu e shi a gụ ndèndé ndi Igbò, mọ bụ íbè ya ne to afọ 30 na 40. Ọ wụ ihe ọ sị na ọ baghi úrù ị de akwukọ ya n'Igbò. E kwerem si o wu eziokwu. Ị de asụsụ Igbò (ne ji akara òdìdè nke De Ọnwụ kèrè) a gaghi ba úrù. Ọ wụ mgbe anyi dozimara nkụzi Igbò wụ mgbe anyi gị ne de ihe nke ọma na Igbo (mọ bụ kwa na anyi gi lúfù akara òdìdè nke ndi Romanu). 1 Like |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by Obiagu1(m): 5:50pm On Aug 05, 2012 |
^^^ Ife Igbo ji sie ike ọgụgụ bụ maka anyị ewerọ akala "phonetics". Ife kwesịrị ị bụ akala anyị ka anyị ji mele okwu. Ka m malụhụ atụ, na Bekee, ha na-ede "there/their" na "meat/meet" mana ofu ụda ka ha nwere. Ị fụ mkpụlụ okwu ndịa, ị mala ife dị ịche ozigbo. Mana n'okwu Igbo, ị marọ na ihe a na-ekwu maka ya bụ "gun", ị fụ "egbe" ị nwere ike kpọ ya "kite" tupu ị mata na ọbụrọ ya, ị nahachị azụ wee gụharịa ife ị gubulu. Ọ ya mele Igbo ji taa akpụ. 1 Like |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ChinenyeN(m): 5:55pm On Aug 05, 2012 |
Ezeagu akatanda e. Ekwere m la ke ilufu ederede Romanu. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ezeagu(m): 9:09pm On Aug 05, 2012 |
Obiagu1: ^^^ Ọ wụ eziokwu ki kwuru. Nkem wụ nà: ọ bụ nà ndi mádu a naa chọ ị de asụsụ Igbò (maka ọ dighi ihe he ji ya eme, Beke wụ naani ihe he jị e ri ihe), ihe niile di ka 'phonetics" na ihe ndi ozo anyi gị ji a kuwari Igbo a gaghi mẹ ihe owụla. Naani ishi ọwụwa ka ndi madụ gị ne nye onwe ha. Na ụlọ nkuzi nọ n'ime ala Igbò kwa ha na chị madu ọchị na ị kwụ madu ihe maka ị sụ asụsụ Igbo. Ndi nne na nna ne kò-ekò shị na nwa ha a naa sụ asụsụ ebe ndi nke ha! Ọ wụ ihem sị na ndi chọri ka ọnụ ọgugu ndi na sụ Igbò bilie, ọ wụ ị tuwari oto e shi kụzi madu. ChinenyeN: Ezeagu akatanda e. Ekwere m la ke ilufu ederede Romanu. Ọ wụ ya! |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by Gboliwe: 10:12pm On Aug 05, 2012 |
Jookwa nu o. Unu no hu? Nda ele ihe du? |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by AndreUweh(m): 10:59pm On Aug 05, 2012 |
Gboliwe: Jookwa nu o.I wu onye olebe, o yiri ka i wu onye Ogbo?. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by odumchi: 11:29pm On Aug 05, 2012 |
Obiagu1: I feel that to improve Igbo language more, it needs to be more centralized while we incorporate various dialects into it. Obiagu, ihe a dikwa nma kama bia lee ya aga m za vu ya. Anyinde ekwesighi irughari Igbo ka o di ka English. Aga Igbo di wu nma ya. Ndaa asusu odo di n'elu uwa mara nma ka Igbo? Aga nmadi suwa Igbo o tii "bu" m'okwan "wu" n'okwu ya aga soro ya sokwa na uto ya. I juo mo, m ga si ka e gbeni ichikota (centralize) Igbo ndi ive an asu-asu karia aga o di ugbua. Onyenye suwa olu mba ya. Ihe m na eze wu ka e gbeni igbuisigba olumba dum di na ali Igbo. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by odumchi: 11:30pm On Aug 05, 2012 |
ezeagu: Chimamanda sị Igbò a maghi otu e shi a gụ ndèndé ndi Igbò, mọ bụ íbè ya ne to afọ 30 na 40. Ọ wụ ihe ọ sị na ọ baghi úrù ị de akwukọ ya n'Igbò. E kwerem si o wu eziokwu. Kowaturu m nwa. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by odumchi: 11:33pm On Aug 05, 2012 |
Gboliwe: Jookwa nu o. Gboliwe anyi nowa. Ndaa kwan maka gonwo? I za eye? Olu gi na ada ka nke nde Ihechiowa/Ututu. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by Gboliwe: 12:00am On Aug 06, 2012 |
Andre Uweh:obu le zi. M bu onye Item, (the only town in Oxford dictionary) du ra Bende Abia state |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by Gboliwe: 12:02am On Aug 06, 2012 |
odumchi:O bu asusu ndi Item. A bum onye Item. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by Obiagu1(m): 12:08am On Aug 06, 2012 |
odumchi: Ị hapụ Igbo ka ọ dị kịta, ọ ka ga na-afịa arụ ọgụgụ. Onwerọ ulu ọbala n'anyị ama ngụwu ife onye olu ọzọ dele. Ị maa afụ n'asụsụ ndị ọzọ okwu a na-ede n'ụzọ nabụ. Ị maatụ, na Bekee ị maa afụ "what is going on now?/what iz zoing on gow?" ma ọ bụ Spanishi "lo que está pasando ahora?/ro que está bazendo afora?". Ọ dị otua n'Bekee ma ọ bụ Spanishi, ha ga na-enwe nsogbu anyị na-enwe n'Igbo. Ị kuzi Igbo ga afia arụ nnukwu. Ị nwere ike sụọ olu gị mana ịchọọ ị dee ife onye ọzọ ga agụwu, ị dee ya na "izugbe". A bịa n'ife gbasara igbu olumba nine dị n'anị Igbo, ọ garọ eme maka ndị Bekee ka nwekwalụ "dialects", fa anwụsiberọ. |
Re: Igbo Bia Suọ Olu Inyì :: Come And Speak Your Dialects by ezeagu(m): 1:35am On Aug 06, 2012 |
odumchi: Ndi toro ruru afọ 30 na 40, di ka Chimamanda Adichie (amaghim ihe decade bu na igbo). |
(1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (Reply)
The Social Prejudices Between Oratta(owerri) And Isu Groups Of Igboland. / Question !! What Is *sim Card* In Yoruba Called? / Why Do (some) Nigerians Abroad Despise Black Americans?
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 40 |