Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,159,227 members, 7,839,205 topics. Date: Friday, 24 May 2024 at 03:01 PM

Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office - Culture (4) - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office (16395 Views)

Olubadan-In-Council Declares Eze Ndigbo Illegal / Cross Cultural Marriage:interesting Tweets From White Lady Married To A Nigerian / Celebrating Ndi-igbo (2) (3) (4)

(1) (2) (3) (4) (5) (Reply) (Go Down)

Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by ifyalways(f): 9:50am On May 31, 2012
Odunnu,kedu onye/ihe bu 'Agaba' ? O bu headimaster anyi?ka o bu aha egwu surugede?lol
Chinenye,o putara n'eziokwu na i maghi asu ma o bu ede igbo izugbe?
Odumchi,echiche gi ahu mara nma nani n'isi ma o bu na akwukwo,o gaghi adaba in reality.Okwazi ego n'ekwu n'ala Igbo?Ya gazie
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by nedu210(m): 5:17pm On May 31, 2012
ChinenyeN: Igba iche maka ochichi aha, o si n'umu isu Igbo? Ihe m na-ekwu bu na e kwesighi ime umu isu Igbo ka o so n'ihe na-agba iche, madu aga chota ochichi aha. Ile o du sef, a na-azu ochichi aha azu, ma a ga ana-azuta ya na-agbanyighi umu isu Igbo. Ya mere ana m asi ka i chota uzo ozo ka nma. Forgive my weak attempt with Izugbe; just hope I made sense.
Nenye eche m nanị ngwa ka ịma asu?
Edemede gi tukwaru m na anya, mana ịgbaru mbọ. For making sense, it did make sense.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by nedu210(m): 7:15pm On May 31, 2012
Onlytruth: Umu Igbo kwenu ozokwa!

Ana m ekele kwa unu ozo!

Biko nu, onwere ihe m choro ka anyi tinye anya n'ime ya.
Ihe ahu bu maka ide Igbo izugbe (central written Igbo) n'ebe a oge nile.
Ama m na odighi nfe ide Igbo izugbe oge nile, mana o buru na onye obula jisie ike, o ga amuta ka esi ede ya. cool
Unu lee anya, unu ga ahu na ana m anwa! (i dey try no be small cool ) grin
Soso ntupo bu ihe koro na Igbo m na ede n'ebe a. Mana onye mara agu Igbo, ga agu Igbo m na ede na enweghi nsogbu.
Mana ka o dina, ana m ekele unu maka ide na Igbo.
O dighi nfe!
Jisie nu ike.
Chukwu gozie unu nile.

O bu m,

Eze Onlytruth, Ndu di n'eziokwu nke mbu na ala Igbo. Eze Ndigbo Nairaland. cool

Ọha na Eze nl ndewo nu o, Eze, okwu gị dị nma, mana echeghị m na ọ dị nfe ide igbo izugbe nke(odide), odide na nwọta igbo izugbe nke(odide) bu ihe tara akpu nke ukwuu, ọbụlụ go di na onwelu onye ma edegha nke ọma, ọga afịa ndị na agugha ahu nwọta. Oga aka nma na ọnye ọbuna ga na ede izugbe nke ana asuasu anyi na akpọ (igbo etiti) dị ka onu ndị ugwu na ndị agbọ si dị, mana nke na amasị ghị m ma ncha bụ onu ndị.
Chukwu gọzia gị ma gọzia umu igbo nine.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by ChinenyeN(m): 2:30am On Jun 01, 2012
ifyalways: Chinenye,o putara n'eziokwu na i maghi asu ma o bu ede igbo izugbe?
Ama m edetu ya, mana ide ya ede na-egbu m ezigbo oge. Amaghi m asu ya nkeoma. Isu ya na-ara m nnukwu ahu ma na-eme ka m yiri onye nsu. Ngwa na-aka m nma n'olu ma n'onu ma n'edemede kwa.

nedu210: Nenye eche m nanị ngwa ka ịma asu?
Edemede gi tukwaru m na anya, mana ịgbaru mbọ. For making sense, it did make sense.
I chere n'eziokwu, ma mkpa m abughi nkea. O bu nghota ihe m kwuru maka ochichi aha na umu isu Igbo. O di m ka a ghotara ya.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by odumchi: 5:28am On Jun 01, 2012
Ahulam ihe unu kwuru maka echiche'm a. Onwere onye nwe ma otu anyi nwere ike iruzi ya?

Na uche'm e nwere ike ime ya eme, kama o ga atu onu.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by Odunnu: 5:57am On Jun 01, 2012
Ochi - classic. A mu ta go m ozo!
Ochi = Lol. Nkea atori e mu isii.
@Ify: nwere m ndidi, agam aza gi ajuju gi onye bu agaba mgbe na adigi anya. Chere ka m chia ochi
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by achi4u(m): 12:07pm On Jun 01, 2012
odumchi: Ahulam ihe unu kwuru maka echiche'm a. Onwere onye nwe ma otu anyi nwere ike iruzi ya?

Na uche'm e nwere ike ime ya eme, kama o ga atu onu.
Onyeisi,Oburu na anyi amaghi ede asusu anyi nke oma,Obuzi awusa ka obu Yoruba ka anyi ga ama edeta nkeoma?,ya mere umu igbo ka anyi jisie ike na ede igbo izugbe karia iji olu mba nke ga esi ike nghota.

Eziokwu, ide igbo izugbe tara akpu mana anyi ama ji mgbagbu ghara ogu.
Ejikwa m oghere a n'ekele unu n'ile maka oke mbo unu na agba ihu na asusu anyi na aga nihu.

udu diri unu
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by odumchi: 8:54pm On Jun 01, 2012
achi4u: Onyeisi,Oburu na anyi amaghi ede asusu anyi nke oma,Obuzi awusa ka obu Yoruba ka anyi ga ama edeta nkeoma?,ya mere umu igbo ka anyi jisie ike na ede igbo izugbe karia iji olu mba nke ga esi ike nghota.

Eziokwu, ide igbo izugbe tara akpu mana anyi ama ji mgbagbu ghara ogu.
Ejikwa m oghere a n'ekele unu n'ile maka oke mbo unu na agba ihu na asusu anyi na aga nihu.

udu diri unu

Ihe anhu m'dere o bughi Izugbe? Ihe anhu abughi olu mba'm. Ihe m'si bu ka onye mara ka anyi nwere ike isi emezi echiche'm a bia kwuputa okwu.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by OdenigboAroli(m): 10:17pm On Jun 01, 2012
Umu Igbo kedu etu unu mere? How you like my Izugbe now?
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by achi4u(m): 11:36pm On Jun 01, 2012
odumchi:

Ihe anhu m'dere o bughi Izugbe? Ihe anhu abughi olu mba'm. Ihe m'si bu ka onye mara ka anyi nwere ike isi emezi echiche'm a bia kwuputa okwu.
Nwanne mmadu,otu ihe ka m na gi na ekwu.Ngwa guhari okwu n'ile ndi aghu m onwe m dere ka ihu na Obu akwa ariri ka m na ebe nighi ndahachiazu umu igbo dahachiri n'ide ma obu isu asusu igbo.

ya bu na echiche gi dika aki mmiri si na igwe wee daa.

ka chukwu gozie gi ma chewekwa umu igbo n'ile no ebe a makwa ebe uwa soturu.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by odumchi: 1:32am On Jun 02, 2012
achi4u: Nwanne mmadu,otu ihe ka m na gi na ekwu.Ngwa guhari okwu n'ile ndi aghu m onwe m dere ka ihu na Obu akwa ariri ka m na ebe nighi ndahachiazu umu igbo dahachiri n'ide ma obu isu asusu igbo.

ya bu na echiche gi dika aki mmiri si na igwe wee daa.

ka chukwu gozie gi ma chewekwa umu igbo n'ile no ebe a makwa ebe uwa soturu.

Nsogbu adighi. Echere m na ighotaghi ihe m dere. Anam ekele gi maka ekpere oma i na ekpere anyi bu ndi Igbo. Ka chineke goziekwa gi etu isi choro ka ya mee anyi.

Umu Ugbo, eziokwu ka nwanna m achi4u na ekwu. Ka anyi ghari idala azu na asusu na edemede Igbo. Onye obula nwere echiche na otu anyi nwere ike isi echebe asusu anyi ya bia kwuputa ka Eze Igbo NL na ndi otu ya hu ya anya.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by Onlytruth(m): 3:33am On Jun 02, 2012
nedu210:
Ọha na Eze nl ndewo nu o, Eze, okwu gị dị nma, mana echeghị m na ọ dị nfe ide igbo izugbe nke(odide), odide na nwọta igbo izugbe nke(odide) bu ihe tara akpu nke ukwuu, ọbụlụ go di na onwelu onye ma edegha nke ọma, ọga afịa ndị na agugha ahu nwọta. Oga aka nma na ọnye ọbuna ga na ede izugbe nke ana asuasu anyi na akpọ (igbo etiti) dị ka onu ndị ugwu na ndị agbọ si dị, mana nke na amasị ghị m ma ncha bụ onu ndị.
Chukwu gọzia gị ma gọzia umu igbo nine.

Nsogbu adighi nwanne. Ihe ka mkpa bu ka anyi na ede Igbo oge nile, maka na o ga eme ka anyi muta ya karia. Ana m aguta ihe nile onye obula na ede na ebe a; soso na o odighi nfe igu ha nile.
Achoputara m na ide Igbo oge nile ne eme ka mmadu mara ede ka karia.
Ya mere onye obula jisie ike na ede Igbo.

Dalu nwanne.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by FACE(m): 10:38am On Jun 04, 2012
Umunne na umunna, ekele diri unu nile. O na amasi m na onye obula no ebe-a na agba mbo i-de Igbo. O bu kwa eziokwu na anyi kwesiri i-gba mbo n-akuziri umu anyi asusu anyi, maka na nwanne di na mba.

Gbasara i-de na Igbo izugbe; o ga ekwe nghota karia ma o-buru na anyi na ede ihe dika e si a supee (spell) ya na Igbo izugbe, karia i-de ya ka osi a-da na nti anyi. O buru na anyi dee ya otu-a, o ga ekwe nghota karia, ma obuladi (regardless) ma i ji olu ndi unu dee ya. Atumatu (example): anhu = ahu, hwe = ihe etc. O buru na anyi jisie ike dee ihe ndi obere-a ofuma, mgbe o gbadoro anyi, mee ka anyi dee ya ka osi ada anyi na nti (olu anyi), onye na-agu ya, ga-agu ya serere wererem (smoothly).

Ihe ozo di mkpa, bu rikom na kpom (punctuations). Rikom na kpom na-eme ka mmadu mara mgbe o kwesiri izu ike.O buru na i-dere gawa n'ihu ma i-tinyeghi rikom na kpom, o ga e-siri ndi ozo ike i-guta.

Ihe ozo anyi kwesiri i-ma bu na a, e, i,!, o , o(with dot) na aru oru onochiri mkpo aha (pronoun), mbu-uzo (prepositions)na enyemaka ngwa( helping verb).

O buru na i dee onochiri mkpo aha na mbu-uzo dika ha bu okwu nke onwe ha (separate from the verb or conjunction), o ga ekwe nghota karia. I nwere ike i-deko enyemaka ngwa onu ma o buru na i nwere okara elu na okara ala (accents) na computa gi; ma o-bu were okara etiti (hyphen -) jikoo ha onu.

Onye nwekwara ntuzi aka(corrections) na ihe ndi-a, tuzikwaraa anyi aka n'ihi na otu onye anaghi a-bu ama-ama amachaghi amacha.

1 Like

Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by nedu210(m): 5:19pm On Jun 04, 2012
FACE: Umunne na umunna, ekele diri unu nile. O na amasi m na onye obula no ebe-a na agba mbo i-de Igbo. O bu kwa eziokwu na anyi kwesiri i-gba mbo n-akuziri umu anyi asusu anyi, maka na nwanne di na mba.

Ọha na Eze ekene'm.
Nwa naa okwu gị dị nma mana ihe'm a'wọtaghị bụ ebụ'm na uche gị, i'ji edeghari okwu ụfọdị na oyibo, ọbu na icheghi na umu igbo nọ ebea ga awota ihe ị'na ede.
Nwa nna biko adị na edegharị okwu gị na oyibo asụsụ igbo nwelu nwọta zuru oke. Dalu kwa.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by Onlytruth(m): 11:18pm On Jun 04, 2012

Nwanne m FACE, ihe nile i dere mara mma nke ukwu! O teela nnukwu aka m huru Igbo edere ofuma, di kwa nfe na nguta.
Nna o di kwa ka i bu nnukwu onye nkuzi? shocked shocked
I makwa na o ruola afo iri abuo m huru Igbo a mara dee? Eziokwu! Nke bu ihe turu m na anya nke ukwu bu otu i siri mara ihe nile a na akpo akara edemede na Igbo. O dighi nfe ma ncha.

Biko, o buru na i nwee ohere, biko bia na ebe a na akuziri anyi Igbo edere ede. Igbo izugbe bu nke dikariri nfe na nghota na ogugu. Ana m agbasi mbo ike ka m mara ede ya kpom kwem.

Ana m ekele kwa gi ozo ezigbo nwa afo Igbo! cool
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by Onlytruth(m): 11:23pm On Jun 04, 2012
nedu210:
Ọha na Eze ekene'm.
Nwa naa okwu gị dị nma mana ihe'm a'wọtaghị bụ ebụ'm na uche gị, i'ji edeghari okwu ụfọdị na oyibo, ọbu na icheghi na umu igbo nọ ebea ga awota ihe ị'na ede.
Nwa nna biko adị na edegharị okwu gị na oyibo asụsụ igbo nwelu nwọta zuru oke. Dalu kwa.

hehe! grin nwanne aghotara ihe i na ekwu, mana o ga agba gi ghari ichoputa na otutu umu Igbo no na-ebe a agaghi aghota ihe o dere. O di mma otu o siri tugharia ihe ndi tara akpu na bekee ka o wee doo ndi na amaghi agu ya ofuma anya.
Nwayo nwayo ka anyi ga eji wee rachaa ofe di oku. cool
Ekele kwa m gi. wink
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by odumchi: 11:38pm On Jun 04, 2012
FACE: Umunne na umunna, ekele diri unu nile. O na amasi m na onye obula no ebe-a na agba mbo i-de Igbo. O bu kwa eziokwu na anyi kwesiri i-gba mbo n-akuziri umu anyi asusu anyi, maka na nwanne di na mba.

Gbasara i-de na Igbo izugbe; o ga ekwe nghota karia ma o-buru na anyi na ede ihe dika e si a supee (spell) ya na Igbo izugbe, karia i-de ya ka osi a-da na nti anyi. O buru na anyi dee ya otu-a, o ga ekwe nghota karia, ma obuladi (regardless) ma i ji olu ndi unu dee ya. Atumatu (example): anhu = ahu, hwe = ihe etc. O buru na anyi jisie ike dee ihe ndi obere-a ofuma, mgbe o gbadoro anyi, mee ka anyi dee ya ka osi ada anyi na nti (olu anyi), onye na-agu ya, ga-agu ya serere wererem (smoothly).

Ihe ozo di mkpa, bu rikom na kpom (punctuations). Rikom na kpom na-eme ka mmadu mara mgbe o kwesiri izu ike.O buru na i-dere gawa n'ihu ma i-tinyeghi rikom na kpom, o ga e-siri ndi ozo ike i-guta.

Ihe ozo anyi kwesiri i-ma bu na a, e, i,!, o , o(with dot) na aru oru onochiri mkpo aha (pronoun), mbu-uzo (prepositions)na enyemaka ngwa( helping verb).

O buru na i dee onochiri mkpo aha na mbu-uzo dika ha bu okwu nke onwe ha (separate from the verb or conjunction), o ga ekwe nghota karia. I nwere ike i-deko enyemaka ngwa onu ma o buru na i nwere okara elu na okara ala (accents) na computa gi; ma o-bu were okara etiti (hyphen -) jikoo ha onu.

Onye nwekwara ntuzi aka(corrections) na ihe ndi-a, tuzikwaraa anyi aka n'ihi na otu onye anaghi a-bu ama-ama amachaghi amacha.

Face,
Imeela nnukwu o. Ihe a I dere ebe a eyerela mu aka.

@Ohanaeze
Unu na eweli iwe. Agughi m otu esi ede Igbo na ulo akwukwo. Ọ bu ihe mere m ji na ede Igbo otu o si na ada m na nti. Ka anyi gbawa mbo yere onwe anyi aka maka odighi nfe. Unu emeela.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by FACE(m): 12:13pm On Jun 05, 2012
Onlytruth Nwanna, o ruo kwala afo iri-abuo m dere Igbo n'uloakwukwo. N'eziokwu, onye maara Igbo ofuma tulee ihe m dere, o nwere ike inye m akara ato n'ime akara iri.Ihe kachasi mkpa n'edemede obula bu rikom, kpom na i-de okwunile na mkpuru na mkpuru ma o bu n'ahiri n'ahiri. Ndewo.

Nedu210 Nwanna, aghotara m ihe i kwuru, mana ihe m jiri tapia ufodu okwu ndi ahu na bekee bu maka na ha a-bughi okwu ndi igbo nile na ekwu mgbe nile.E dere m ya otu ahu ka onye obula ghota, n'ihi na o bughi onye obula maara ufodu okwu ndi ahu. O nweghi onye uta diri na nkea, n'ihi na ufodu okwu ndia bu okwu ohuru nke mere na soso ndi guru akwokwo Igbo na ndi bi n'ala Igbo na ndi na a-ga uka (church) e doro n'Igbo bu ndi ga ama ihe ha putara.O bughi ndi bekee nile maara ka esi ede okwu bekee.

N'ezie, a-hutubeghi m onye n'ekwu ihe di ka "supee re m aha gi", kama ihe onye obula n'ekwu bu " spelliara m aha gi", "ngwa nye m example" "e use-ola m uzo ahu last week".

Igbo anyi zuru oke, mana eziokwu bu na olile anya nzuputa asusu Igbo di n'aka ndi ime obodo na ndi okenye. Onye Igbo bi na nnukwu obodo n'ekwu okwu, o na ejikari okwu bekee agwa ya ka oburu engligbo.O bu ihe nwute, mana o bu ihe mere eme.

Odumchi, jisie ike; i bu nwa mazi kajara akaja. Ekele diri gi.

Chinenye, I maara otu esi ede Igbo izugbe ofuma. Jisie ike.

N'obodo m n'ime Umuahia, o buru na ndi okenye kara aka noro na nzuko na ekwu okwu, o nwere ka ha si ekwu okwu n'usoro n'usoro n'ato m uto. Onye kwu chaa okwu, o si "aka m ji a-habeghu m ye" (literally : i have not let go of my grips, meaning; my interests are still on this issue).Mgbe ndi okenye no n'ama !

Umunne na umunna, aka m ji a-habeghi m ye !
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by ifyalways(f): 8:41pm On Jun 05, 2012
^Okwa otu aka na ukwu ekelemere Odunnu jiri chilie ukwuya abuo n'elu ekele Nri Priest.lol
Udi ekele nke a dikwa 'behuge'! Ngwanu umunne m ukwu na aka m nile di n'elu na ekele.
Ka Chineke kasie umunne anyi nile ndi umunne ha nwuru na ihe mberede ugbo elu mere n'izu a.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by NRIPRIEST(m): 11:26pm On Jun 05, 2012
ifyalways: ^Okwa otu aka na ukwu ekelemere Odunnu jiri chilie ukwuya abuo n'elu ekele Nri Priest.lol
Udi ekele nke a dikwa 'behuge'! Ngwanu umunne m ukwu na aka m nile di n'elu na ekele.
Ka Chineke kasie umunne anyi nile ndi umunne ha nwuru na ihe mberede ugbo elu mere n'izu a.

Nwadi ana ji isi wee mu Onicha Ado,ekele mu na ebunye gi bu nke juputara ukpa! Ify,ife mberede ugbo elu nkea jidere umunne anyi wee gbuo gbaram anya nmiri. Na aka ozo,echerem na oga abu ihe di mma ma unu bu umu nwanyi Igbo mepee elili umu ada Igbo ga eji na ekwukorita ihe gbasara umuada umu Igbo...Tulee ihe m kwuru ma gwaghachikwa m ihe I chere maka ya. Kedu ebe Odunnu gara? Odika owuona oso ka J5..lol
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by odumchi: 4:40am On Jun 06, 2012
@Achi4u

Nwanna, kee ka i mere?
Mu na ndi ozo nocha ebe a ahula na I bu ezigbo nwa afo Igbo na acho odinanma obodo ya. Anyi huru na i choro isi otu obula I nwere ike isi eyere Ndi Igbo aka, ya di anyi nma na anya. Achoro mu iju gi oburu I choro iso na otu ndi na eyere Eze aka ka o luo olu ya. Olu anyi a abughi ihe obere yana anyi na etinyekwa oge na ime ya. Oburu I choro iyere anyi aka otu obula I nwere ike isi, mee tu ka mu mara.

Imeela nu.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by odumchi: 4:42am On Jun 06, 2012
NRI PRIEST:

Nwadi ana ji isi wee mu Onicha Ado,ekele mu na ebunye gi bu nke juputara ukpa! Ify,ife mberede ugbo elu nkea jidere umunne anyi wee gbuo gbaram anya nmiri. Na aka ozo,echerem na oga abu ihe di mma ma unu bu umu nwanyi Igbo mepee elili umu ada Igbo ga eji na ekwukorita ihe gbasara umuada umu Igbo...Tulee ihe m kwuru ma gwaghachikwa m ihe I chere maka ya. Kedu ebe Odunnu gara? Odika owuona oso ka J5..lol

Oke nmuo, Keekwa nu?

Onwere ihe m choro ijuta gi: kedu ihe "Odenjinji", "Aroli", na "Agboro" putara? Imeela na nke iru.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by OdenigboAroli(m): 7:52pm On Jun 06, 2012
odumchi:

Oke nmuo, Keekwa nu?

Onwere ihe m choro ijuta gi: kedu ihe "Odenjinji", "Aroli", na "Agboro" putara? Imeela na nke iru.

Odum nwanne,i nweghi nsogbu ma oli; "Odenjinji" means "sound of greatness" ma obu "uda ebube" in Igbo. Arondizuogu ppl use the word too. "Aroli" is one of the most ancient site in Umuoji,Idenmili where I came from and our progenitor Oji Okodu resided in that house when he lived,hence its called " Iba Aroli" or "Obi Aroli" which means the "heads quarter" where chiefs are received. The name "Aroli" according to my father is one his titled names and ppl greeted him with it,hence his place of residence was known as Iba Aroli. "Agboro" simply means lineage, descendants or bloodline.
Odum,aman na ighotara etu mu si kowaa ya?

I hope you guys forgive me for writing in english. It would have been hard for Odum to understand me.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by Odunnu: 8:06pm On Jun 06, 2012
NRI PRIEST:

Nwadi ana ji isi wee mu Onicha Ado,ekele mu na ebunye gi bu nke juputara ukpa! Ify,ife mberede ugbo elu nkea jidere umunne anyi wee gbuo gbaram anya nmiri. Na aka ozo,echerem na oga abu ihe di mma ma unu bu umu nwanyi Igbo mepee elili umu ada Igbo ga eji na ekwukorita ihe gbasara umuada umu Igbo...Tulee ihe m kwuru ma gwaghachikwa m ihe I chere maka ya. Kedu ebe Odunnu gara? Odika owuona oso ka J5..lol
oso gini? Obu maka ihe nedu kwu oto? Mba nu. Mberede ka eji ama dike! Ify na acho imebi m, abum 'feyjin'.
@face: odika e bu onye nkuzi asusu igbo. Okwu gi kwu oto ka ihe 'nedu.lol
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by OdenigboAroli(m): 8:21pm On Jun 06, 2012
Odunnu:
oso gini? Obu maka ihe nedu kwu oto? Mba nu. Mberede ka eji ama dike! Ify na acho imebi m, abum 'feyjin'.
@face: odika e bu onye nkuzi asusu igbo. Okwu gi kwu oto ka ihe 'nedu.lol

Ezi ogeli, ofodulu ka m jilizia ndi uwe oji wee choba gi! Odunnu,onye ebee ka i bu na ani Igbo?

Nri Priest.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by Odunnu: 9:09pm On Jun 06, 2012
Eche m na anyi akpa si go nke ahu? Ka mu gwazia gi nke na aburo eziokwu, onye ma, e ga ahapu m aka.
Abum onye Nara-unateze di na Nkanu LGA na obodo ukwu Enugu. Lol
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by OdenigboAroli(m): 10:06pm On Jun 06, 2012
Odunnu: Eche m na anyi akpa si go nke ahu? Ka mu gwazia gi nke na aburo eziokwu, onye ma, e ga ahapu m aka.
Abum onye Nara-unateze di na Nkanu LGA na obodo ukwu Enugu. Lol

Daalu nne, i ma na Igbo sili na aku luo uno amalu onye kpalia.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by odumchi: 10:59pm On Jun 06, 2012
Odenigbo Aroli:

Odum nwanne,i nweghi nsogbu ma oli; "Odenjinji" means "sound of greatness" ma obu "uda ebube" in Igbo. Arondizuogu ppl use the word too. "Aroli" is one of the most ancient site in Umuoji,Idenmili where I came from and our progenitor Oji Okodu resided in that house when he lived,hence its called " Iba Aroli" or "Obi Aroli" which means the "heads quarter" where chiefs are received. The name "Aroli" according to my father is one his titled names and ppl greeted him with it,hence his place of residence was known as Iba Aroli. "Agboro" simply means lineage, descendants or bloodline.
Odum,aman na ighotara etu mu si kowaa ya?

I hope you guys forgive me for writing in english. It would have been hard for Odum to understand me.

Nwanna, I meela nnukwu. Otu a i si kpara m ihe nile dicha nma. M ghotachara ihe nile ikwuru. Ihe a egosila m na I bu ezigbo nwa afo ala Idenmili maara nto ala (history) ndi ya.

Jisie ike.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by NRIPRIEST(m): 12:24am On Jun 07, 2012
odumchi:

Nwanna, I meela nnukwu. Otu a i si kpara m ihe nile dicha nma. M ghotachara ihe nile ikwuru. Ihe a egosila m na I bu ezigbo nwa afo ala Idenmili maara nto ala (history) ndi ya.

Jisie ike.

Odum,daalu nke oma; Ihe odinani na nto ala Ala-Igbo na amasi mu nke puru iche.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by ifyalways(f): 7:33pm On Jun 07, 2012
Hahaha,Odunnu i si na ibu onye ebe di?Amu na asokwa m.
Odenigbo,kedu zi ife "Nkisi Aroli" putara?O bu ofu ife ka Iba Aroli?
A likerim Odenigbo,a nam akpo di m 'Odenigbo,Odogwu na Agu nwoke' ma m choro i napu ya ihe ma o bu m cho ka o mesie m ife ike.LOL
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by NRIPRIEST(m): 8:53pm On Jun 07, 2012
ifyalways: Hahaha,Odunnu i si na ibu onye ebe di?Amu na asokwa m.
Odenigbo,kedu zi ife "Nkisi Aroli" putara?O bu ofu ife ka Iba Aroli?
A likerim Odenigbo,a nam akpo di m 'Odenigbo,Odogwu na Agu nwoke' ma m choro i napu ya ihe ma o bu m cho ka o mesie m ife ike.LOL

Ajo anu !! Bad girl never change; a likerim your style.

Ify,"nkisi" bu afa orinmili di na Nkpor na Onicha....."Aroli" bu afa something mana amarom ife oputalu.
Re: Eze Ndi Igbo Nairaland Cultural Office by ZUBY77(m): 9:14pm On Jun 07, 2012
ifyalways: There's this Igbo presenter then @ ABS onitsha that i was sooooooo in love with,Mazi Leonard Onah.Anyone knows his whereabouts?I would appreciate any info on/about him.
Cheers.

Leronard onah lives at ugwuagba obosi near old spare parts market where i market my goods from china. I know his house and i see him often.

(1) (2) (3) (4) (5) (Reply)

Ooni Of Ife Reveals Why He Likes To Mingle With The Common People.See His Reason / A Brief History Of The Igarra People..my People / Oluwo Of Iwo Land Is Dead!

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 108
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.