Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,158,505 members, 7,836,954 topics. Date: Wednesday, 22 May 2024 at 02:56 PM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady (294019 Views)
15 Reasons You Should Be Proud To Be A Nigerian(pics) / Igbo Kwenu! kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/Lady / Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady (2) (3) (4)
(1) (2) (3) ... (38) (39) (40) (41) (42) (43) (44) ... (227) (Reply) (Go Down)
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by toshmann(m): 4:41pm On Apr 20, 2012 |
presido1: lol. odumchi amaghi ncha wu ncha . . . . odumchi: odumchi igaghi anyu nshi . . . inshort, nyem 5 minutes ka m mee gi aru now |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by preselect(m): 4:49pm On Apr 20, 2012 |
NRI PRIEST: Ifeoma, i ga ebute ogbaghara ebea maka "ukwu sugar" gi! Stick with one or else umunna no ebea anolu gi nzuko ma hanye gi nwoke masirim anyi! Be warned ! Agwala m Ify ka o cool uo down Ify anaghi anu. Ihe ga emecha di mma, nwee ndidi ka m nweta obele ego, anyi ji ya mee wedding, jiri nwayo ga Zuru ulo na north London, biri n'udo. Ify anaghi anu. Everyday Ify na umu boys. Toshnwayi of all people. Nwoke m ahu anaghi di ezo ya ezo na o na achu pieces. Oluokwala nwayi o. Still Anya ya no ebe Ify no. Ify ha ga atuwa gi ime o. Toshman tuwara umunwayi abuo ime na Cardiff gbafuo gawa amelika. Ana acho ya acho na wales. Isi o wu ashi, jigodi style mee ya invite to London. I ga ahu excuses Ukwu ya mee mistake dabala UK o wu paddington police station ka o ga a ga were one room Ify hapu umunwoke Biko. Ahukwara nu m gi n'anya. |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by toshmann(m): 4:50pm On Apr 20, 2012 |
odumchi 1 Like
|
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by toshmann(m): 4:59pm On Apr 20, 2012 |
pres-elect: nwoke m cool-uo down. gaa gbara ogwu gi nuo i ka na asa efere na central london? nnaa darfur, masters a imega na london kemgbe 10yrs, ana aguchakwa ya agucha? i no school oge tony blair wu PM, noro there Gordon Brown a chia, now Cameron, i ka n'eme masters noro chewe ify, ify kara aka, owughi for the feeble minded. ify di HOT!!!. O na enwu oku oge nile. so o need-iri nwoke kara aka, di capable, i kuda the fire from time to time, otherwise o ga a-boil-u up wuru volcano. and anyi achoghi ka ify anyi nwee volcanic fire injury so umu guys ga na aku nkwa(not music, nb odumchi). as for felicia(aka felimbombo) agaba/faketan turu ilulu na 1905 si . . "as long as nwa agbogho mepere ukwu ya, umu afrika ga n'adaba in between the legs, maka nkwa" |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by preselect(m): 5:00pm On Apr 20, 2012 |
Chei, okwa di nne muru toshman a? And okwa nwayi luru ya? Hewu!!! Ebere emegburula m umu mmadu |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by toshmann(m): 5:05pm On Apr 20, 2012 |
nwoke m mere onwegi ebere. toshmann nwa mama di fine and fit. i no need your ebere. a wu m crown prince of umumkpi crown prince anaghi alu otu nwayi nna nna m luru ato. nna m ji 1 + X (where X is an integer ranging from 1-100). you do the maths 1 Like |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by preselect(m): 5:07pm On Apr 20, 2012 |
Lolololololol Toshnwayi igbakala m final You win. Bye bye. Ka m ga choo ihe m ga eri |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by toshmann(m): 5:08pm On Apr 20, 2012 |
no shaking i dey here, i de wait for odumchi. ya biawa |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by agabaI23(m): 5:34pm On Apr 20, 2012 |
NRI PRIEST:Nwanza rijuo afo. o cheere chi ya aka mgba. Marakwa na nwannu bere na ngige, ngige n'egwu, nwannunu n'egwu. Kpachara anya gi nihi na onye a na-agwo ibi o na-eto afu bu udene na-akpo ya oku n'ajo ofia. Ajuo m gi ozo, gi bu udene, kedu onye chiri gi ozo? Nri priest my hairy behind |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by NRIPRIEST(m): 7:30pm On Apr 20, 2012 |
agabaI23: You guys better hold me before nkupu this guy eze na onu ! I makwa na ikpe adighi ama nwa NZE ebe nnia no na ogbo okwu! Nwata 'a ekwuwaa onu! Nwanne i'makwa na UFIE bu egwu ndi Eze ? Isi kota ebu ogbakasia ya! Likene ebunu maka na nnai na akpa atulu! Agaba, nwa pulu eze aburozi obele nwa-- enenia nwa ite ogbonyuo oke! Jebekeneli maka agadi nwanyi kaa nka odika ejiro ego nuo ya! Again, oji onye na ana ji onwie! Kam juo gi ozo; obu Ezeani Nri ka I na atulu inu sef ?? |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by agabaI23(m): 7:59pm On Apr 20, 2012 |
NRI PRIEST:Nwata na-agba surugede amaghi na surugede bu egwu ndi muo. Nri-priest, I mana o na-abu atuoro omara omara, atuoro ofeke ofenye is no'ofia. Ejighi ogologo amu amaja agadi nwanyi maka ohugo nke kariri biati. Ijiji na-enweghi onye ndumodu na-eso ozu aba n'ili. Ntukwu na-agu ngwere mana odudu ekweghi ya. Marakwa na o bu ukpana isi kara aka na-eje ahia ngwere na-azu. Ukpana okpoko buru, nti tiri ya. Wepu aka enwe ofe tupu o ghoo aka mmadu. |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by toshmann(m): 8:21pm On Apr 20, 2012 |
Nnaa raa nu okpo. Mana before unu araaa okpo gwanu m in time ka m mee organize commercials during the okpo. Jiri nke ahu mere obere ego |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by NRIPRIEST(m): 10:53pm On Apr 20, 2012 |
agabaI23: Okwa ofeke na eji aka-ekpe atu be nnia aka. . . Agaba,malukwa na ekwu sia na ama ebulu naa na obu. . .Gi bu atulu na acho ipu mpi isi kakwaa gi akaa. . .nwata bunilu nnia enu ogodo ga ayochie anya. . .Agaba,wetuo obi maka na onye fee Eze,Eze eluo ya aka. . .Agaba, onye ekwero ka oha aga ebu ya gafee ama nnia. . .Biko,jilu nwayo maka adi agba aka ali OSISI ORJI. . .Agaba,asim gi jebekene maka iwe nwanne adi elu na okpukpu! Kam zibe gi nkea na aka! |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by BigBenoski(m): 12:11am On Apr 21, 2012 |
ngwanu, igbo bu igbo ekene m! nwa mmuo emegbule nwa mmadu, nwa mmadu emegbule nwa mmuo. ka egbe bere ka ugo bere kwa. Onye sikwanu ibe ya ebela, biko ya zi ya ebe oga ebe |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by NRIPRIEST(m): 12:28am On Apr 21, 2012 |
toshmann: odumchi Toch,ife'a adiro fair naa! How can you illustrate the image of our own learnerd brother into a common boy-boy? Ekwekwana kam kuo gi ife nkulu AGABA! |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by ifyalways(f): 12:44am On Apr 21, 2012 |
Pres-elect,a hukwara m gi n'anya,kama i huru ihe ahu Tosh dere,eziokwu no ya.Ahu m choro nkwa 24/7.I wish i can change but owu m kere onwe m?Owum tinyere oku na ukwu m ? Youngies,lol.I di sure na owughi gi choro iga skull of "ikpulogy" n'aka tisha Tosh? Agaba na Nri priest,biko o gini na afio?O nwere nwanyi unu n'azo?Aghotaghim unu abuo. Odumchi,ele gi?Tosh nawa e-win.lol@ Ibiobio classes.I would try. OAM4J,case is settled.Ify went back to Pres-elect,the rightful husband and they lived happily ever after.lol Bigbenoski,ndeewo.idi "big" ebe nile?hahaha. . .ajuju! |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by OAM4J: 2:13am On Apr 21, 2012 |
@Odumchi, Thank you my guy, with a friend like you, I know i don't have to watch my back. @ifyalways, Nigeria movies dey always get part 2, then part 3 and part 4. The next part is where pres-elect starts to misbehave too, and in part 3 other suitors came to disturb u, and part 4 is where I came to rescue you and you realized how much u love me while teaching me Igbo language. Then we got married had children and lived happily ever after. and the movie ended. lol |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by agabaI23(m): 9:22am On Apr 21, 2012 |
NRI PRIEST:Okwa I ma n'ofeke adighi ama mgbe ekere nkú ukwa. Agwa ogbenye ihe eji aba ogaranya owere odudu tinye na ngada ya. Nri priest marakwa na okoro na-erughi éru wara ogodo, ikuku bia o buru ya n'ogodo ya. Nwqta kwuhie onu, osi na ya agwa okenye okwu. Ejikwa onu iji rie ede rie ji maka oke soro ngwere maa mmiri, okocha ngwere, o gaghi ako oke. Were ehihie chowa ewu oji ma gupukwa aka enwe n'ofe tupu o ghoo aka mmadu. Nri priest gi bu ezekudene kedu onye chiri gi ozo? |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by NRIPRIEST(m): 7:01pm On Apr 21, 2012 |
agabaI23: Okwa I ma n'ofeke adighi ama mgbe ekere nkú ukwa. Agwa ogbenye ihe eji aba ogaranya owere odudu tinye na ngada ya. Nri priest marakwa na okoro na-erughi éru wara ogodo, ikuku bia o buru ya n'ogodo ya. Nwqta kwuhie onu, osi na ya agwa okenye okwu. Ejikwa onu iji rie ede rie ji maka oke soro ngwere maa mmiri, okocha ngwere, o gaghi ako oke. Were ehihie chowa ewu oji ma gupukwa aka enwe n'ofe tupu o ghoo aka mmadu. Nri priest gi bu ezekudene kedu onye chiri gi ozo? Agaba, nwata adulu iku anya oghotaro,aga alupia anya...okwanu onye nwanne ya na agba ajo egwu na ako oko iku anya...Agaba,ima na agwa nti nti anuro,egbupu isi nti esolia naa ije...malukwa na nmili zolu ezo ga emechaa kochaa..ma lota na nwata kwochaa aka osolu ogalanya lie ife... Agaba, kam juo gi; onye na ejiro aku ona echi Ozo ? nya dibakene, maka na aku fesia odalu awo...Agaba,kam jukwa gi ozo; obu Ezeani ka i na aju onye chilie Ozo !!! |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by agabaI23(m): 7:47pm On Apr 21, 2012 |
NRI PRIEST: Nri Priest, Ikwikwi nyuru aru si umu nna ya kweere ya egwu, ha si ya tufiakwa na a naghi ekwere ihe ojoo egwu. Achoro m ka I mara na ire oma ka ejula ji aga n'ogwu. Ukwa ruo oge ya o daa. Ma na onye huru ukwa di n'elu ya were osisi dutuo ya, O gaghi aka aka wee daa. Mgbe ahu chi ojoo ariwa ibe ya elu. Ihe okenye no ala hu, nwata kwuru oto, Ogaghi ahu ya. Nri priest, O na-abu emee ngwa ngwa emeghara odachi. Anokwana na mmiri ka ncha baa gi anya. marakwa na nwannunu nekentioba muta efe efe ebeghi ebe, di nta amuta agba agba atughi atu. Were nwayoo ka ofe roro aro zuoro gi nri. Ka m juokwaa ozo, gi bu ezekudene, kedu onye chiri go ozo? |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by NRIPRIEST(m): 12:04pm On Apr 22, 2012 |
Nwokem, okwa ima na akwulu oto laa nwanyi di ime, amuo onye ala----chetakwa na ekene ghalu nkuli aka buzi nkpali----Agaba, onye nya na nwanne ya na eli nni osi buto oku, chubia maka na obu nsi---nwune,oburo oku nine dalu ibibele nyulu anyu----ya diba,mbosi nta ka ayi chuo na owelle nshi. . .nkea bu nke ikpeazu Ezeani Nri ga asa gi okwu maka adi afusia ebe ana echi Ozo,jebe ebe ana alu agwu! |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by agabaI23(m): 1:45pm On Apr 22, 2012 |
NRI PRIEST: Nwokem, okwa ima na akwulu oto laa nwanyi di ime, amuo onye ala----chetakwa na ekene ghalu nkuli aka buzi nkpali----Agaba, onye nya na nwanne ya na eli nni osi buto oku, chubia maka na obu nsi---nwune,oburo oku nine dalu ibibele nyulu anyu----ya diba,mbosi nta ka ayi chuo na owelle nshi. . .nkea bu nke ikpeazu Ezeani Nri ga asa gi okwu maka adi afusia ebe ana echi Ozo,jebe ebe ana alu agwu!Chei ewu ataa m igu n'isi. isi akwu dara n'ala edetula aja. Nri priest, anu gbanaa taa echi bu nta. Ugbala anaghi adikata ocha diwa oji. Ugwu muta mgbaji ukwu agadi nwanyi amuta agakata akwuru. O ji oso agbakwu ogu amaghi n'ogu bu onwu. Agaba kwuo okwu, nri priest ekpuchie onu. Ekene m unu |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by ifyalways(f): 4:22pm On Apr 22, 2012 |
Nri Priest 2,Agaba 0 Kedu ka Agaba ga-esi je nwusia nmai na otunweke bia na Nkpor na akuwa bottle bikonu? Eze Nri gbachapu ya nkiti maka na asiri guwa agbara o tewe uri onu.LOL Ok,Odumchi so iji style wee gba oso.No attempt isaghachi Toshman okwu?no fall my hand oh,bia zigara Tosh ozi. OAM4J,lol.Actor don dye so movie don end.no part 2 and 3.Ify and pres-elect are back together,haterz can suck their fingers till it rots.LOL Igbo bu Igbo,ekene m unu. |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by NRIPRIEST(m): 5:46pm On Apr 22, 2012 |
ifyalways: Nri Priest 2,Agaba 0 Ify nwanyi di oke onu,nne ya diba maka na ogu adiro ebe aga anu ya. Biko,keduzi ebe ODUMCHI jelu ? Amu na atogodim hia...lol |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by odumchi: 2:05am On Apr 23, 2012 |
ifyalways: Nri Priest 2,Agaba 0 Chai, Ify itukwasi'm obi? NRI PRIEST: Ma gikwa Nri? Odumchi anaghi ekwu ihe olu eme ihe odo. M'nawa ese ya. Tosh nwonyeke'm, chokwa ebe ima ezo ihu gi. Lol |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by odumchi: 2:06am On Apr 23, 2012 |
OAM4J: @Odumchi, Thank you my guy, with a friend like you, I know i don't have to watch my back. What are mates for |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by odumchi: 4:44am On Apr 23, 2012 |
Ngwa, Toshmann abiala'm. Bia nara akarachuchu. Unu Lekwa mgbe ndi bekee choputara Toshmann lol
|
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by odumchi: 4:46am On Apr 23, 2012 |
Ohanaeze leekwa ihe Ify ji Tosh na Pres-Elect na eme. Nwanyi emeela ha iho ewu.
|
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by odumchi: 4:47am On Apr 23, 2012 |
Tosh chere obara aba. O chefuola na oka wu driver mu lmao.
|
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by odumchi: 4:51am On Apr 23, 2012 |
Asim unu na unu ekwekwa ka umu nwanyi mechuo unu ihu. Lekwa ihe Ify na eme ochie oche kagbara nka di ka Tosh na Pres-Elect
|
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by ifyalways(f): 6:29am On Apr 23, 2012 |
Looooooool Ala Aro bia lere oh.Odumchi,i di mean. Ergh,biko i puru i gbanwe ewu m abuo ahu to Toshman na Ikomu or Nedu210?lol Mgbe obula unu na enye m "thick laps"! Y'all should not invite Mr Cork here. . .and ofcourse i can cook and cleans(((no offeinse))) Eze Nri,imela.Ahu dimkpa ahu ogologo imi ya. Tosh o wurum ka Odumchi mere ihe a,O wuru m eh,O wuru m,a ga m . . .rofl Ya gaziere ndi Igbo,Izu uka ohuru oma @ mmadu dum. Mbano united:2,Aro fire boys:12 |
Re: Igbo Kwenu! Kwezuo Nu! Join Us If You're Proud To Be An Igbo Guy/lady by NRIPRIEST(m): 7:55am On Apr 23, 2012 |
Odum, chei ! Nkea bu below the belt line! |
(1) (2) (3) ... (38) (39) (40) (41) (42) (43) (44) ... (227) (Reply)
Nigerian Pidgin English And Their Meanings / Pictures Of African Traditional Clothing! / Ogun Awon Bàba Wa
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 69 |