₦airaland Forum

Welcome, Guest: RegisterLoginWith GoogleTrendingRecentNew

Stats: 3,325,118 members, 8,420,452 topics. Date: Thursday, 04 June 2026 at 08:07 PM

Toggle theme

Mortiple's Posts

Nairaland ForumMortiple's ProfileMortiple's Posts

1 2 3 4 5 6 7 8 ... 30 31 32 33 34 35 36 37 (of 37 pages)

CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 12:56pm On Aug 14, 2008
Mortiple:
GBAM OKWU KAM NURU NA NTI.
GWAM OKWU KAM NURU NA NTI grin cheesy
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 12:53pm On Aug 14, 2008
tasiana:
Agara m AWOL grin
@Tasiana,
Ka omenala nzuko siri diri, iga edebata aha afresh na nzuko a, maka na ifallu go na arrears. cheesy
Kpoturu, Ifyalways ma obu Echelon, kaha gwagi ihe ndi iga eweta. cheesy

Ibiaduola!

BAKASSI, Ofu obodo gbara ndi-Igbo ngba-okpuru ejela ije alolo (journey of no return). Ha buzi Cameroon!
Umunne na Umunna, kedu ihe unu chere gbarasa nke a?


GBAM OKWU KAM NURU NA NTI.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 12:27pm On Aug 14, 2008
ifyalways:
ole onye choro i webata aka enwe na threadia?olekwanu mmadu nile?

Obi adighim nma ooooo.unu ripitacha biko.
Youngies, Echelon,Rubi, Mortiple, Kashiff, Pres na ndi ozo sad
Igbo si na: Ana egbutu orji, Umu Enwe ana enyighari elu.
When the Iroko tree is being cut down, the monkeys (on it) begin to migrate.

Ify, anyi adighi aga ebe obula. Ebe a na amasim karacha ebe ozo.

Ndib'anyi, nosienu ike!
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 10:59am On Aug 12, 2008
echelon:
Please can anyone translate the following into Igbo:

Secure Password Authentication

someone is asking
Echelon, obu gi bu "Professor of Igbo Language" anyi nwere na Nairaland.
Igbo si na: Onye gara na ebe ngwere si ya bunye ya oche, ga aju onwe ya ajuju si - kedu nke ya bu ngwere noduru.
A visitor who asked his host, the Lizard to offer him seat should first ask himself, which one is the Lizard sitting on.

Secure = (as in obtain) Nara
Secure = (as in make safe) Chekwaa
Password = Okwu mbanye (okwu nzuzo) grin
Authentication = undecided

(Nara) Chekwaa okwu mbanye gi.

Ifyalways, Youngies, Presido, Agaba, Rubi, etc, biko tinye nu onu.
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 5:50pm On Aug 11, 2008
@Agaba,
Nwanne, otu isi ago ofor (ekpere) na amasim nke ukwu. Dika aha gi siri di, ina ago ofor ka nnukwu mmanwu (seasoned masquerade). Jide kwa nke iji. Asim ya dikwaragi mma.

ChinenyeN, Darfur, Romeo, Presido, Ifyalways (onye m na afubeghi nbu ma fuya nanya) grin, nakwa umuIgbo ndi ozo, nodu nkeoma.
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 3:35pm On Aug 11, 2008
darfur:
hmmn
nna threadia na agbawojuzi m anya
lectures, lecturers and students ejula ebe n'ile
hmmmn, ebelebe igba grin
Nwanne, ifugo ivem na afu (Do you see what am saw)? grin

Adighi asu Igbo, obuzi okwu bekee. Odizi ka anyi na agb'izu ndi nti-ike eba. Ndi mba ozo na aghotazi ihe anyi na ekwu. Obuzi hu ogbako Ndigbo ozo. embarassed
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 3:20pm On Aug 11, 2008
Igbo, kelenu!

@Ifyalways, nwetu ndidi obere. Akam na ahazi ya.

Igbo si na: Agbara gburu onye nwe isi ya, obu onye ka oga ahapu?
The deity (oracle) that killed its head custodian, who then will it spare?

Igbo si na: Mmiri maa onye-ije, ije ya aru o!
When rain beats a traveler, his/her journey will come to an abrupt end.

Igbo si na: Onye nzuzu (iberibe) amayi na adanneya bu obia.
A fool does not know that his mother's first daughter (i.e. married) is a stranger in his house.

Igbo ndewo nu o!
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 6:00pm On Aug 06, 2008
IGBO KWENU!

@Ifyalways na youngies,
unu nwere ike ige egwu ahu ngwara unu ugbua.
IMEEM adibeghi ready. Etinyere mu ya na Naijapals.com
http://www.naijapals.com/?L=music.index&Sambola_Mama_Skylark_International_Band&id=2251
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 2:24pm On Aug 06, 2008
chisimdi:
@mortiple, nwanna ndewoo,dalu maka comment gi na picture.Mana aluo lam di,ejikwam umu Ato(umunwoke)
Umu atoo? Chineke anukwam gi na ukwu, ndi nugi n'aka akari go!
Biko agwakwala digi. lipsrsealed
Anyway, appreciation abughi njo.
grin

@IFYALWAYS, obu gini n'eme zi?
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 1:51pm On Aug 06, 2008
Igbo kwenu!

Biko nu, na ogbako Nairaland land, onwere ihe nchoro ka anyi le'ba anya. Kedu ka ichere ndi ozo gi na ha na ekwu okwu ebe a di especially ndi gi na afubeghi foto ha before? Afa m (my crystal ball) na gwam sina:

Agaba: Tall, slim, dark, smokes all smok-ables, no-nonsense person, woman-lover, ladies man, a replica of Okadigbo (Oyi of Oyi) grin Nwanne ewekwala iwe na obu gi kam jiri malite. Ibu Okemmadu, burukwa Ngala ji Igwe.
Oziomatv: bu onye ama-Jihova (Jevovah's witness), humorous, dark, etc.
I[b]fyalways:[/b] my crystal ball has lost contact with the spirit world;
Mortiple: no comment. somebody help!

Biko, obu ihe egwuru egwu. Obughi ihe nkpari.
grin grin grin
Igbo kele nu!
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 1:22pm On Aug 06, 2008
Okporokporo ijiji NOT Ogborogboro ijiji.

Error regretted.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 1:19pm On Aug 06, 2008
@youngies
Anugom ihe ikwuru (I've heard u). Anokwam na IMEEM na emeya arrange ugbua.

Nke a bu ilulu nnuru na ofu egwu ndia mu na cho itinyere unu.

Ogborogboro ijiji (Giant Fly) gara na ebe nwa'gbo na anyu nsi, ya masiya nke ukwu. Ngbe nwa'gbo rapuru, ya acho iri nsi a, omaghi na nkita nu na akuku na eche ka nwa'gbo a puo, nkita achoo iri nya na nsi, Ijiji a ebere na elu akwukwo ede, we si "ahize nkita erighi mu na nsi".

A Giant Fly went and perched where a (beautiful) lady was excreting. Immediately the lady left, it attempted to do justice to it. It didn't know that a hungry dog was nearly watching and waiting for the 'meal'. As the fly landed on the , , the dog rushed the , The giant fly perched on a Cocoyam leave nearby and exclaimed: "thank goodness, the dog didn't eat me up with the excreta!"

The song: Ndi oru uzo agbaghara ibe ha (by Skylark). Coming to u soon!

Igbo biri nu!
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 6:32pm On Aug 05, 2008
presido1:
@Onyinye
I'gbaliri nke oma ma owuru gi tapiara.
Jisi ike one day you will drop proverb here.
Na'ha Jesu Kriisti di nwelu anyi, Ami!
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 5:49pm On Aug 05, 2008
@Queenisha
Gini ka imere Agaba123? Ji obi choochi wee so ya.
Igbo si na: asu (saliva) nwanne adighi agbaniye elu (enu).

Romeo, Presido, Onyinye 2 (kedu maka Onyinye1?), Oga Sarge [s](odim ka ibu Sergeant na Naijurian polishi)[/s], Rampant, ula na kwa ndi ozo, kele nu! Asim, onye agbala osoo!

Ya rawa ahu, gbara ogwu gi nuo! (When the going gets tough, take your medicine!)

Onye si asusu Igbo laa, nwunye ya amukwala ejima (kwelem: ise!) grin
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 3:34pm On Aug 05, 2008
@Queenisha
Nne, odikwam ka inwere special anointing na ikpe ekpere. Biko, kwalite anyi na ekpere! Igbo si na: Eme nwata dika emere ibeya, obi adiya nma. grin

Ozioma+tv, nwa Mba5, nnoo! Iyoduola! Imeela nkpo'le? Mu onwem bu nwa Mba9 na ekele gi.

Igbo si na: onye iberibe amaghi na nwa nnaya bu obia.

Ohaneze Ndigbo, Nairaland, birinu!
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 2:34pm On Aug 05, 2008
@Ifyalways
Otege muna Ndi Aro Okeigbo. Oyim nwanyi nbusu zirim uzo esi eri okpo grin bu nwafo Aro. lipsrsealed Onwere abuo ndi ozo kama anyi erughi na aakwa (bed).

Nya buru ilu onye Aro, so Chukwu nwe final say.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 1:48pm On Aug 05, 2008
@Ifyalways,

Echeyim na egwu a nwere link but I can upload it on IMEEM for ur listening pleasure. Definitely not today. Enwerem egwu ndi ga amasigi na ebe ahu nakwa na my PC. Strictly Igbo old skool.

The same Skylark used this phrase in one of its songs:
Ije love, Ije love egbuom na uwa! The album has interesting tracks such as Ndi oru uzo (agbaghara) ibe ha, Ochonma kpara aku; Sambola mama, and a special track dedicated to the people of Aro Oke-Igbo (your people). Imana Dan Orji (Skylark Band) bu onye Arochukwu maa amuo ya na ala Owerri? Ify nne, enwekwaram egwu Mary Kalu (Aro Women Cultural Group). Ihe ndi Aro na amasim.

Igbo biri nu!
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 1:21pm On Aug 05, 2008
@Ifyalways,
Imana eziokwu bu ndu! Nwaada Chisimdi mara mma na emeru ahu! Gi bu Ify achoyi kam fu pics gi. Amaghim ma idi ocha ma idi oji, ma iburu ibu ma idu , Anyway, agwa bu nma nwanyi. The way isiri diri versatile, gi si otuahu ma'mma, ihe ga emebi.

ifyalways:
lol
@Mortiple,ndooo cry cheesy cry cheesy cry cry cry cry grin owu otu a ka o siri mee?cheei boiz atala ahuhu grin lol ije dublin na Mortiple grin
Ije uwa, anyi ejewele ije uwa, anyi ejewele! (Skylark led by Dan Orji). grin Do you know that song? I've got it! Ima nam bu old skool. grin

Anyway, ije muna Dublin nwere Part 1 and Part 2. Part 1 ka ika nuru. Watch out for part 2. Coming soon to the Cinema near you!! Don't miss it. grin grin

Nnam gwaram na ya adighi ebere onye nwuru anwu akwa; na obu onye di ndu. Akwa ona ebere onye di ndu bu: akwa agwara m gi agwa?
My father said to me that he does not mourn the dead, but the living. The summary of his mourning is: Did I not warn you?

Ify nne, harawa.

Igbo, kwenu!
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 12:09pm On Aug 05, 2008
@Ifyalways,
Akwum na ogba (I'm in the court). Olee otu ihe nu? (How are u?)

@Chisimdi
Imana mma aluu alu!
Eziokwu, iyiri Genevieve, I mean, Genevieve yiri gi. grin
Isi inu na ebee - Ireland? Obodo ahu na atum egwu. Ote laa muna ya. Ofu nwaada nchoro ilu na'for abuo gara aga, visited there. Ndi be ha, pressured her not to return to Naija, but marry another suitor over there. They saw her as a doorway for them to be visiting the country. Asa nwannem abala (enwela ego), onwere onye osoo nso? Nnunu kwuru (kpara) akwu ya na nke nwata huru (furu) ya na anya.[/color] (The bird that built its nest near the home of a child, loves the child.) I mourned her for months but have got over it. Well, it's now history! Besides, Chukwu adighi ehi ura. Eze puo, eze anochie. [color=#990000]

@Youngies, Echelon, Aloy Anyanwu Emeka, Onyinye2, ndaa?

Igbo-bu-Igbo, ekelem unu!
CultureRe: Two Questions On Igbo's & Ijaw by Mortiple(m): 6:48pm On Aug 04, 2008
ifyalways:
LMAO ! ! ! !
@Onyi,don't give this guy the attention hes looking for. wink
grin grin

What do you expect from the Liberian-based Nomad. He has refused to grow up. Check out his contributions elsewhere. I liken him to the proverbial slowpoke that grows in stature but not in wisdom.

Ara gaa agba ndi-ara! undecided
RomanceRe: When Is A Guy Ready To Marry? by Mortiple(m): 3:03pm On Aug 01, 2008
MY PERSONAL VIEWS:

(1) He must attain physical, emotional and spiritual maturity (just like many have said). Marriage is not for babies!

(2) He must have a means of livelihood. That is, he must be 'busy'.

(3) He must be able to feed three people convenient (himself, wife and a third party)

(4) He must have a place of his own, not a squatter. This makes it possible for him to take vital decision(s) without being influenced by parents or relations.

(5) When he begins to concentrate more on inward than the outward beauty of the opposite sex.

(6) When he understands that relationship is all about tolerance and is willing/ready to obey this fundamental principle.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 6:45pm On Jul 30, 2008
Igbo kwenu!

Okuko si na nya labara (ura) ula abughi na nya erijugo afo, kama obu na chi ejigo.
The chicken said that it went home to roost is not because it has eaten enough food, but because of nightfall.

Okuko si na ihe kpatara ya ji ele anya na elu maya riwe nri bu na ihe na egbu ya si na elu abia.
The chicken said the reason why it does not desist from looking towards the sky when eating is because the creatures (eg Hawk) that feed on it usually descend from above.

Ify nwanyi oma, Youngies, Echelon, Rubi, etc biri kwe nu!!
CultureRe: Which State Are You From? by Mortiple(m): 3:05pm On Jul 29, 2008
AMAKAONE:
Imo State, Owerri, Umuaka Village
@Amakaone, where are u from in Umuaka? Is it Umuele, Ibele, Uba, Isiozi, Achara, Amiyi, Ugbele, etc. In fact Umuaka is a familiar territory.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 7:04pm On Jul 24, 2008
ifyalways:
Na wao,o gini choro ime ebea?unu ebidokwa ozo angry angry angry
o nwere omenala ndi ufodu ebe na ala igbo na eme na agbam hari.o buru na nwanyi na nwoke na eme enyi,along the line,nke nwanyi abia di ime,nke nwoke emebeghi ihe obula n'isi nke nwanyi sha angry mana onye o bula ma o na eme di babe enyi.O buru na dika ihe uwa siri di,nke nwanyi anwuoo with the afo ime chukwu buru anyi nile ihe ojoo! ndi be nke nwanyi asi ha luo di girl na onwu.ie o ga agba nkwu di girl mecha ihe nile a na eme n"isi nwanyi bia lie ya ka nwanyi ya.udika ihe a ,o di nma na echiche gi huh
to me oooo,am not a fan of sex before marriage cheesy but still,e cherem na di omenala dikwa njoo undecided anyway undecided
Ify, ome nala a, dika isiri kwuo, di kwa egwu (fearful). Adighi eme ya na obodo nsi bia.
On the other hand, kedu ka nwoke tozuru etozu ga eji kporo nwa onye ozo free-of-charge.
Nya buru gi iga ekwe? Igbo si na: Onye si na obughi ya, ya buru ya gini ka oga eme? huh

Ndumodu m (my advice), mee nke ike kwere gi (do something). Akporokwala nwa onye ozo na efu. Akwukwo nso anabatayi ya (the Holy Book does not encourage it).

Igbo, biri nu!
CultureRe: Igbo Kwenu ! Kwenu Kwezo Nu ! Join Us If You Proud To Be An Igbo Guy/lady by Mortiple(m): 4:14pm On Jul 23, 2008
Uche2nna:
Igba!!!!!! Nke ahu adighi amakpu obi!!! Alusi Okija has been sold to a musuem in France
Nwokem, isi na Alusi Okija mere gini?
Rapu Ogwugwu Akpu aka. Fa nu ife a ikwuru, fa ga eme gi invite to appear before the ALUSI APIRI API within 7 days or , grin

Igbo si na: onye kpaa nku ahihia, ngwere abiaraya uri. huh

Uche2nna, deme deme.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 4:01pm On Jul 23, 2008
ifyalways:
Mortiple nno.
kedu ejima gi Kahiff?
more ilusssssssssssssssssss nti anyi di open smiley
udo di
Kashiff gara ezum ike grin Oga alota oge na dighi anya.
Igbo si na: Adighi aju oke-mkpi ebe orahuru, ihe kaa mkpa bu otetara ura.
It is needless to ask about where a he-goat passed the night, the concern should be did he return home.

Igbo si na: Okokporo kwanyere onwe ya ugwu, ajuo ya "kedu ka umuazi di?"
When a bachelor esteems himself before people, they would inquire about his children's wellbeing without even knowing he has none.

Cha cha cha, young bachelors kwenu!
Cha cha cha, old bachelors kwenu!!
Cha cha cha, retired bachelors kwezue nu!!!
grin grin
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 4:08pm On Jul 22, 2008
Chaa chaa chaa,
Igbo, rie nu!
Igbo, biri nu!!
Igbo, meka nu!!!

Umunne na Umunna, ndi Igbo kwoo aba, anam ekele unu. Asim ya diri anyi nile mma.

Alotolam (I am back)! Anam abia na ogbako anyi am bu Nairaland kwa mbosi, kama adighim enwe ohere itinye onu na okwu. Igbo si na: Ihe (Ife) dabara na mmiri, ukwu ka eji acho ya.

Ify, Echelon, Youngies, rubi, otele, na kwa ndi ozo, asim ndewo nu!
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 3:50pm On Jun 09, 2008
Ify nne, hara wa.
Ahu ihe ka ubi ere oba.
Mere mere mere, ekweghi umu nwanyi gbaa aji-onu.
For your eyes (ears) only, ndi nga anyi si nam MUST ilu nwanyi this year. Nwa guy na emene okongwu. grin grin

Igbo si na:
Aturu ime, aturu echiche,
Amuo nwa, amuo obi uto.
Getting pregnant brings about fear, safe delivery brings about happiness.

Igbo si na:
Nwa nnunu bere na odu igu na achoo egwu oga agba
(The little bird that perches on palm frond is anxiously waiting for music to dance to).
RomanceRe: Ibo Girls by Mortiple(m): 2:48pm On Jun 09, 2008
@Poster (Mallam Musa),
Your thread is a confirmation of who you really are - MALLAM. Like someone rightly observed, the word: MALLAM, when spelt from left to right or otherwise will give same answer: MALLAM. No wonder Mallam will always be Mallam.

Tell me, why would a sensible Igbo girl give in to an Aboki like you? Tufiakwa!!

Onye awusa na ata akpu ndu. grin grin
Music/RadioRe: Tribute To Igbo Music Past And Present. by Mortiple(m): 12:09pm On Jun 09, 2008
sheniqua:
In memory of a legend Chief Stephen Osita Osadebe
May your kind soul rest in perfect peace.
Your music lives on.
O yes, Osili' nwa Mama's music lives.

Tribute to past Igbo musicians like Celestine Ukwu, Ali Chukwuma, Joe Nez, Goddy Ezike, Show Promoter, Capt. Mudi Ibe, Dr. Sir Warrior, Mangala and Ichita, all of Oriental Brothers, Area Scatter, Show Promoter, etc.

Not forgetting living legends like Herbert Udemba, Mike Ejeagha, Oliver De Coque, Bright Chimezie, Raph Amarabem (Peacock Guitar Band), Dan Orji of Skylark Guitar Band, Alloy Anyanwu, etc.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 1:10pm On May 28, 2008
echelon:
Is this an acceptable translation for ikpu?
Sacred! Too heavy for my mouth. grin grin lipsrsealed lipsrsealed lipsrsealed

Igbo si na:
Nwanyi gwa di ya onye ojuru, ogaghi agwa ya onye okwetala.
A woman would proudly disclose to her husband, the men who made advances at her but failed, but would not disclose to him those who succeeded.
CultureRe: Igbos come show your proverbs skills by Mortiple(m): 11:32am On May 28, 2008
echelon:
Not once, not twice nor thrice have I heard this proverb:

E jighi akpata a tufuo aba ogaranya
You don't get wealthy by wasting accumulated wealth

Who has a better translation? grin
MY TRANSLATION: No body gets wealthy by wasting the little s/he has acquired.

Echelon, iri aya, imela kpo le, ndaa, ele otu ihe nu (I mean, kedu ka idi)? cheesy

1 2 3 4 5 6 7 8 ... 30 31 32 33 34 35 36 37 (of 37 pages)