Syncan's Posts
Nairaland Forum › Syncan's Profile › Syncan's Posts
1 2 3 4 5 6 7 8 ... 120 121 122 123 124 125 126 127 128 (of 129 pages)
manny4life: Yes, I think I stated that. The second question was the only one directed to him "personally" but others are opened. If I missed it, my apologies and thank you for catching it.Nnoo Nwanne...Anyi no na-ele You are Welcome brother... We watch. Oge anyi na-ekwu maka afo ojuju, o bu maka ndi uche ha di na ajuju ahu, bukwazi ndi ga ebinye aka By satisfying requirements, we are talking to the electorates who are also interested in that question |
manny4life: Biafra Rep, thank you for your distinct submission. orufe: A QUESTION FOR BIAFRA REP.Naani ajuju nke a di n'enu ka ajuru biafra Rep n'onwe ya, Ajuju ndi ozo diri ha nile na-azo ochichi The above is the only question yet directed specifically to Biafra Rep, others questions are for the candidates in general Maka ajuju a, Okwu onu nwa amadi a, nke anyi wetara site n'ibe akwukwo(17)kwesiri idaju obi tinye kwuo aziza ya. With regards to this question, this his statement below made in page(17)should be satisfying, in line with his response. Biafra rep: Ndigbo nmanma nu! A bu mu nwa afo Igbo, ahurum ndi Igbo n'ile n'anya. Site na Asaba rue n'Awka, Ekwulobia, Udi, Nsukka, Abakiliki, Afikpo, Owerri, Mbaise, Aba, Ngwa, ma rue na Obigbo ya na Etche, anyi n'ile bu ofu, Igbo bu oke mba. Oburu na unu atunyerem na ndorondoro ochichi nairaland, agam agba mbo ejiko anyi n'ile onu. Ama mu omenala Igbo nke oma, ejerem akwukwo ma turu ugo. Ama kwa mu asusu bekee nke oma. Biko unu bianye aka ebe edere ''Biafra rep'' Igbo ekelem unu, Ndeewo nu![Biafra rep] Greetings Igbos! I am an Igbo man and I love all my people. From Asaba to Awka, Ekwulobia, Udi, Nsukka, Abakaliki,Afikpo, Owerri, Mbaise, Aba, Ngwa,up to Obigbo and Etche,we are all one, a great nation, Igboland. If I'm elected,I will work relentlessly towards actualizing a fraternal Unity amongst us. I'm deep rooted in the culture and tradition of our people,I am well read and communicates fluently in English as well. do kindly cast your votes on "Biafra Rep" |
orufe: A QUESTION FOR BIAFRA REP. PointB: I would like to hear Biafra_Rep response to this question. Biafra rep: Ndigbo nmanma nu! A bu mu nwa afo Igbo, ahurum ndi Igbo n'ile n'anya. Site na Asaba rue n'Awka, Ekwulobia, Udi, Nsukka, Abakiliki, Afikpo, Owerri, Mbaise, Aba, Ngwa, ma rue na Obigbo ya na Etche, anyi n'ile bu ofu, Igbo bu oke mba. Oburu na unu atunyerem na ndorondoro ochichi nairaland, agam agba mbo ejiko anyi n'ile onu. Ama mu omenala Igbo nke oma, ejerem akwukwo ma turu ugo. Ama kwa mu asusu bekee nke oma. Biko unu bianye aka ebe edere ''Biafra rep'' Igbo ekelem unu, Ndeewo nu!Okwu a bu okwu mbata Biafra Rep n'ogbo (pg 12).O gosiri na nwa amadi a mara umu nne ya. Ma a ga m arapu ya ka o kwuru onu ya oge o biara. Udo! With the above words, Biafra Rep announced his entrance into the race (pg 12). it signifies his awareness of his tribesmen. However He himself will address these when he takes the stage. Peace! |
Obasi nke Igwe, Otito na Ebube diri gi maka ubochi ohuru nke a! Gi bu onye bu uzo kpere azu;neekwa ikpere ala. Aga m n'iru na udo ka anyi choro n'ala igbo nile o! Anyi siri ihe oma mere anyi mekawziri ndi nwunye di anyi o! To God in heaven, be praise and glory for this new day! We prostrate before you; alpha and Omega.Peace and Prosperity in Igboland! May your blessings to us be extended to our neighbors as well! Igbo nile n'otu, ma ndi no n'ulo ma ndi no n'ezi, anyi e kelee unu. Rie nu! Nuo nu! Kwezuo nu o! Ihe anyi choro bu onye biri ibe ya ebiri. Ihe anyi ga-eri bia mana nke ga-eri anyi gbalaga o. Ndi obia nokwanu n'etiti anyi Nnoo nu. Obiara be onye abiagbula ya; ka o ga-abu o laba;ka mkpukpu gharakwa i pu ya n'azu. Anyi choro ndu Mmiri;ndu Azu o! Our greetings go to all Igbos both at home and abroad.Harmonious living is our desire! . May success be our portion. To our Visitors we say welcome. May the guest not constitute a nuisance to the host; that he may not go home with an accidental hunchback. What we want is Live and Lets Live. N'uzo puru iche ekele anyi na-agara HRH Eze Odumchi nke mbu nke ndi igbo NL.Otu aka ahu ka anyi na ekelekwazi Ezenwanyi Mma si na chi, Lolo ogugua nke mbu, na kwa ndi nile na-enye aka na nhazi ndoro ndoro ochichi a. We salute in a special way HRH Eze Odumchi 1 of nairaland Igbos. In the same vein, we greet the amiable Queen Oguguo 1, as well as all those involved in the electoral process. Ubochi a kara-aka eruola,Ugo e berela na mgbagbu,a tupula yabu okpukpu n'ezi;ka e lezie ka nkita ga-esi luo ogu diri ya na ndi mmuo. The D-day is here, the stage is set, the bone has been thrown out;lets now be spectators in the debacle between the dog and the spirit. Biafra Rep Campaign Organisation! |
[b]Nke mbu:Anyi kelere eze nwanyi Ogugua ndi igbo nile dika o siri roputa Nwa amadi a bu Manny4life ka o soro na ndi Oka ikpe. Mazi Manny bu onye nwere ako na uche, isi jukwara ya oyi nke Ukwu. First: We express our appreciation to Queen Ogugua of e-Igboland for the appointment of Mr Manny4life into the Election Tribunal. Mr Manny is wise and cool headed. Nke abuo: Anyi jikwa oghere a na ekwuputa na anyi aloghachila azu na ndoro ndoro a ebe o bu na aka PointB a puola na ya. Secondly: We use this opportunity to declare that we are poised to continue in this race since PointB will no longer have a hand in it. Anyi bidoro na enyozi ya enyo, ma gwakwa ya n'ihu ihe na ewute anyi mana ochegharighi. Ewezuga oge o si na Biafra Rep nwere nani ntunye aka abuo ebe o bu ato(pg 17), Unu lee anya unu ahu na o noro na-agupu Biafra Rep na ndi kenere ekene ka e mechara ntunye aka. O bunadi mgbe Biafra Rep putara nke ugboro abuo, bia kenee umu ibe n'uzo doro anya, ya bu PointB ekweghi ya ekele dika o siri kwe ndi ozo. Ihe nile gbara na anwu ka onye obula hu ya. We became suspicious and made the reason clear to him but he did not retreat. Not withstanding the initial error of publishing a vote of two instead of three for Biafra Rep(pg 17),it is visible that he refused to acknowledge that Biafra Rep has made his acceptance public .Despite the fact that Biafra Rep came out a second time to make a more comprehensive speech, PointB never acknowledged him as he did others. Every thing is evident for all to see. Biafra Rep campaign organisation[/b]. |
Alfamann: If you want to answer his brother, na you sabi.A nuru m na i biara ohuru, Nnoo. Ahula m na i bu onye obara ya na-anu oku, e kelere m olisa bi n'igwe bu onye na enye ahu ike. Onyinye nile chukwu nyere bu maka i ji we nyere umu uwa aka,mana o buzi ka onye e nyere ya siri jiri ya ruo oru ga akpata ma o bara uru ka o bu oghom. Ahula m ka imezi ihe ofuma si anu gi oku n'obi, mana a ga m asi gi jiri nwayo ka anyi ghara i ji nkwo were kwojie aka. Udo diri gi. Nwa amadi ahu, bu onye munwa no na-agbachitere, oge e kwuru na o bughi onye be anyi, ma e gosiri m edemede o dere, bu nke m tinyere n'ihe ikpazu m dere. M were si ya kowaa ihe o putara,o gwula ka m siri mejoo ya. O kwa mu bu nwa ala igbo, ndi meputara ogbunigwe ka o ji okwute ndi ijiputu achu? Onodu anyi a bu oge eji eke na mkpuke(igbo), o bughi oge e ji eke n'obi(nigeria). Ya zaa aha nna ya. |
ndu_chucks: My people, anyone with good heads on his/here shoulders will reject biafra rep's candidacy outright. How can a userids which purports to represent biafra, represent Ndiigbo? Its a known fact that not all Igbos believe in biafra andan Eze who is insensitive enough to be defined solely by biafra is not worthy of the Ezeship. ndu_chucks: My peep have been calling Okoros, Nyamiri way before the war and it was not because they were begging for water. The term was coined by market women because they heard Igbo door to door traders ask fellow Igbos for water when they stoppedal to visit those fellow Igbo traders who operated stalls at the markets.Kedu ndi o na akpo umu nne ya, o bu anyi ka o bu ndi ugwu? |
PointB: So far, Alex101 has accepted his nomination, and has assured us he will give more details.N'ezie, o di anyi bu ndi otu Biafra Rep Organisation mwute n'obi ka i siri kachie nti na akpachapu Biafra Rep. Oha na eze no na-ebe a mara na anyi na akpa agwa ka ndi choro udo. Anyi chetara na anyi duru gi odu n'oge gara aga si gi wepu aka enwe n'ofe. Mana i kachiri nti n'eme ihe i na eme. Okwu onu gi na akpara agwa gi, n'ebe nwa amadi a bu Alex101 no, bu ihe kwesiri ilebara anya. O buru na Iweghachighi okwu ahu ma tinyekwaazi Biafra Rep dika out onye na ndi kelere oha na eze na nroputa ha, Ihe gba oto ga akwudekwa gi n'uzo. Anyi ewerala nwayo were soo yabu ihe mana o di anyi ka o nwere ihe i bu n'uche. Biafra Rep bu onye udo mana o dighikwa agba oso ma e buru ogu bia n'ulo ya. Ukpana Okpoko gburu bu nti chiri ya. Anyi ga agbazikwa nkiti ugbu a ka anyi na-ele.Biafra Rep Organisation. |
ndu_chucks: May I humbly recommend that those of you hard headed, old fashioned, and ignorant posters such as Syncan, who post only in Igbo, that they terminate this behavior ASAP. This behavior alienates many Igbo youths who were born abroad or outside of the East and thus unable to read or write Igbo. These people are nonetheless as Igbo as Ojukwu himself. ndu_chucks: Syncan, Okwute angry Egyptians piafuka gi isi. That quote of yours has zero effect on my pathological composition. mumuBiko nu ndi be anyi, unu ahula ka itibolibo si araputa onwe ya? Biko nu ndi be anyi onye ka na ebuli okwute n'oge ugbua e ji egbe na mgbo alu ogu na akpo onye ozo old fashion hahahaha, I choro ka ogbako a nabata mmadu nile ma noro n'elu ya n'asi chupu syncan. Ignorant bu onye na a maghi na egypt ejighi okwute atugbu mmadu, o bunadi mgbe gboo, o bu na obodo palestine nke mechara buru nke umu izirelu ka e jiri okwute tugbuo mmadu. A na e ji isi ahuru were mara uto nsi, i gbaala itiborobo gi n'anwu. Udo chia. |
PointB: My brother Syncan sorry for replying you in english.Biafra Rep campaign organisation zuru ka e mee. Anyi nwere ndi na atapiara anyi bekee. I nee anya ofuma, i ga amata na anyi na-eso ihe nile na-eme n'ebe a ofuma. I kporo aha ndi tuuru ugo ka ojiri nkeji iri ise na asato gafee erekere iteghete n'ala naijiria, Ijele anyi wee puta; ozigbo o nwetara ozi a,oge o ji nkeji ato gafee erekere iri. Ya mere o jiri kelee onye ihu kelee onye azu, si chukwu gozie mmadu nile, e mesia anyi bu ndi Campaign organisation were buru ukpa ekele gaghariba. O doro onye obula anya n'afo ekweghi ukwu zuru ike, ya mere o jiri gbapu kwa oso, maka a na eme onwo;a na eme ibe ya. O ga abia kowaputa ka o ga esi were chia, mana anyi agaghi ekweta na obughi ya bu uzo kelee oha na eze maka i tunyere ya. Udo Chia!Biafra Rep campaign organisation. |
PointB: Actually, you are the first to respond. We welcome your acceptance and hope to read the full transcript and perhaps your agenda/program as soon as you could. Ji s'ike nwanne.PointB.I si na obu ya bu uzo nye ekele?N'ezie, anya anyi bu ndi Biafra Rep campaign organisation di na-ebe i no. Anyi jiri nwayo dika ndi udo na amasi na-ele gi anya. Nke a bu nke ugboro abuo i na eme ihe dika o megidere anyi. nke mbu bu oge isi na o bu mbinye aka abuo ka Biafra Rep nwetara, nke abuo buru ugbua i siri na Alex101 bu uzo nye ekele. Biko gaa n'ibe akwukwo iri abuo na asato (page 28) ka ihu ekele Biafra Rep. O bughi na mmadu adighi emejo na-amaghi ama, mana agadi nwanyi daa ada ugboro abuo, o ga agu ihe di na ukpa ya onu. Biko wepukwa aka enwe n'ofe tupu ya aghoo aka mmadu. Udo chia! Biafra Rep campaign Organisation. |
spyder880: Umu nnem, anokwa m ebea na enene ihe na aga. Ana m akwado etu unu siri achikota ihea. Agam atunye vote nkem mgbe oge ruru. Igbo bu Igbo mmamma nu o!!!Agu Ike! Ibu a nyi danda na Enugu! Aka na-aru ulo mara mma! Udo diri gi ooo. Biafra Rep Campaign Organisation si gi nnoo. Udo chia! |
klolly: Mazi Onlytruth, imé há ná iheá ngwara úh ugwú gá dili gí ná ala umuigbo nile na e-net. Biafra rep, Alex101 ná mazi manny, na nnuru onu okwu nndia, há dim ka ndi gé eji kota wú umuigbo ná net ma owurú na ayi kwanye ha aka nu ukwu.Klolly, onye udo na amasi! ekele diri gi o. i ma na imirikiti ndi mmadu kwado ya, i mara na ochichi ya di ha mma. Anyi ghotara ihe i na-ekwu, atumatu gi dikwa mma, mana umu igbo ga amata ihe ha choro, maka na a na-esi n'ulo mara mma were puba ezi. Iboola chi? Udo chia. Biafra Rep ga-achi anyi ooo! |
9ja_I_hail: The three top candidates are here by advised to step forward and accept their nominations, and also unfold their agenda/manifestos.Nwanne, o doro onye obuna anya na Ijele anyi ji eje mba bu Biafra Rep, e kelee lari ohaneze maka ntunye atunyere ya, o doro anyi anya,na taata nile bu maka nkweta;na-igu ihe ha ga-eme n'ochichi. Ya mere na tupu taata agwusia, ya bu Odogwu nwoke ga aputa gwa igbo bu igbo ihe o puru ime. Ekele diri unu nile. Biafra Rep campaign organisation. Biafra rep: Anambra kwenu! Imo keleenu!! Enugu Mmanma nu!!! Abia kaanka nu!!!! Ebonyi ndeewo nu!!!!! Anam ekele Igbo n'ile, ma ndi no n'ulo ma ndi no n'uzo ije, ndi Igbo ndi no na mpahara owuwa anyawu, nke ndi bekee na akpo south east ya na ndi nke no na egbere nmiri ma obu south south, anam asi chukwu gozie unu n'ile n'otu-n'otu. Ndeewo nu. |
manny4life: Umu Igbo ekene munu,Aka ndi Nze diri gi Manny4life! Anyi nile no na Biafra Rep campaign organisation, ji obi anyi nile na-enye gi bu dike ekele nke ukwu. Gi bu nwa okuku agbaala obara ka ike ra gi. O bukwazi ihe di mma bu obi egwuregwu nke i nwere, ya mere anyi ji asi gi "Jide ka i ji". Udo chia! Biafra Rep campaign organisation. |
PointB: Nomination has formally closed:Igbo bu Igbo, olu m e kenee oooooo! Biafra Rep campaign organisation na asi ka ihe nile gara unu nke oma. ndeemenu rinne maka mbinye aka unu. Agba nke mbu agaala. Ma chetakwanu na ebe a ga ebinye aka bu ebe e sere anyanwu ututu, o bu ya bu akara anyi ji mara Biafra. Anyi na ekelekwa Onlytruth na Alex101 maka nturu ugo ha so were turu, na asikwa ka Udo chia oge nile!Biafra Rep campaign organisation. |
berem: @pointb,how many nominations per person?Ezigbo nwa ada, i nwere ike itunyere mmadu abuo |
9ja_I_hail: Ndi igbo mma mma nuoo.Ezigbo nwa afo, Nnoo rinne |
Ndi be anyi, Oge akara aka e rubego nu o,onye e binyebeghi aka;biko were oso were ije bia binye aka na Biafra Rep. Ka anyi roputanu onye ga-ejikota anyi onu o, onye mara nke ekwe na-aku n'ikpa udo. O bu dike na-acho udo mana o dighi ejikwa mgbagbu ghara ogu. O bu na mbinye aka anyi ka ike nile di, onye anyi si na o ga-achi bu ya ga achi. Udo Chia! Biafra Rep campaign organisation. |
mafifle: My second nomination is for Biafra_repNwanne mmadu, Biafra Rep campaign organisation e kelee gi o! Ngozi ga-eso gi taa nile. Ihe nile i tinyere aka na ya,bu ihe di mma,ga-aga nke oma. Udo chia! |
Biafra rep: Ndeewo Mazi Syncan, akwum chim n'ala n'ele ka ihe si n'aga. Obi di mu nma n'mbo ina agba n'ihu na ihe na aga di ka okwesiri. Onye asi jide nke oji putara na ihe ona eme di nma. Nnoo, daalu sur.Hey! Ochi na nwata! Aka m di n'elu o! Nwoke oma;enyi ora, Udo chia. |
Biafra rep: please dont disenfranchise any eligible voter, Obiagu stepped down as a candidate and it is right that his supporters would want to jump ship, nomination is still ongoing so I dont see any reason why there change of vote would not count.Oke a dighi eri ihe onye mu anya. Ndi nhazi unu ahula nu? O kwa e mee nwata ka a mere ibe ya obi a di ya mma. Nwa mmadu e megbukwala nwa mmuo, ka nwa mmuo ghara imegbu nwa mmadu. Biko gbanu mbo taa yabu ahuhu maka odi mma nke ndi be anyi. Udo chia! |
Biafra rep: No, Aro i.e Arochukwu with its famed long juju and great wariors during precolonial times is located in Abia state but i guess you are trying to refer to Nri, the fabled and legendary town in Anambra state believed to be the progenitor of Igbo race.Ahia oma na-ere onwe ya o,nwanne buru uzo na anyi na-eso. A biara m si ma i nozikwa ya, onye chi mere eze ga aburiri eze. Udo chia! |
Ngwakwe: I nominate Biafra RepAgu Nna!Ihe oma kpo gi ihu ututu. Biafra Rep campaign Organisation e kenee gi. Onye ga agworo gi ogwu ojoo ga e buru uzo lee ma nnu aturu ya. Udo Chia! |
bandb: Onlytruth and Biafra rep are my candidates.Nwanne onye Eze! Biafra Rep campaign Organisation e kenee gi maka mbinye aka gi a. Ejima Ejima ga-abu ngozi gi, aha gi a banyela n'akwukwo anyi, ubochi nta ka-achuzia n'owerre nchi. Udo chia! |
Oka-aka bi n'igwe olu m e kenee gi! Onye na agozi umu afo Igbo nara mbuli elu o! ka chi booro umu Biafra botara ha ihe oma o! Nke anyi ga-eri bia, nke ga-eri anyi a biala o!Anyi ga na-eje eje;na-abata abata o!Ihe anyi no bu egbe bere;ugo bere, nke siri ibe ya ebela nku kapu ya, n'ihi na o biara igbu anyi bu onwu ya ka o ga ezute. Anyi ga-ebi kaa nka,zuo umu anyi;umu anyi a zuo anyi. Ihe oma ka anyi choro! Maka n'onye si n'ihe oma adighi ya mma;ga-eji nkata ga ikuru mmiri. Anyu miara m;ya mikwaziri nwunye di m, maka na ngozi zuo ora; anuri e zuo ora. Igbo bu Igbo mma mma nu o! Bie nu! Nuo nu! kwezuo nu o! Olee ebe anyi ga-ebinye aka,ebe e sere anyanwu ututu, o bu akara anyi ji mara Biafra. Biafra Rep ka anyi ga-eso! Udo! |
Ebe oku nyuru a wusa owara.Syncan ga-eje zuo ike. o buru na m tabiri azu ta;a ga m eji anu were kwuo ugwo echi. Ka Olisa bi n'igwe chekwaba anyi nile. Chetakwanu na o bu Biafra Rep ka anyi ga-eso,gba mbo hu na i binyere o bunadi otu aka na-ebe e sere anyanwu ututu,akara anyi jiri mara Biafra. Ka chi foo nu, ka chi boo nu. Udo! |
PointB: I regret to inform you we cannot swap nominations. It would be difficult to track or follow if everyone starts asking us to swap nominations.Nke a putara na nke abuo ga abuzi Biafra Rep. |
PointB: Umunna,Unu ahula ihe m jiri si ka e nyochaa ofuma, onye a na-agbara afa ndu o na-amali elu;onye a ga eji chuo aja o kwetala? Ngwanu o chajaa nu. |
saintohia: ^^^^^^Udo di, o teela m no ebe a na-ahu n'ihe nile na-aga na anya ya |
saintohia: Please the Electoral body:PointB na ndi nhazi ndi ozo ngwa mezianu ihe kwesiri omume |
klolly: Mazi Andre Uweh ndéwo, éke né dili Chineke máká nnwá bialá úwá. ní jí gwá ú éziokwu ábum onyé ófu ná ébeá. okwé rém hóta na ígú edémedé neené edegoro ebá abu hé nbé ne fé. Agu gom íhé neené edelé ebá. béyéré Biafra rep ná Alex101 má owurú ná echóró unity ígbó neenéA na m anu onu gi, o na-aha ka ogene |
1 2 3 4 5 6 7 8 ... 120 121 122 123 124 125 126 127 128 (of 129 pages)